President Donald Trump ekwuola si n’ obughikwa obughi n’ obi ichu Jerome Powell n’ okwa US Federal Reserve Chairman.

Written by on April 23, 2025

Aka n’ achi mba America bu President Donald Trump emela ka amata na obughi ebu m n’ obi ya ichu nwa amadi ahu ji okwa US Federal Reserve Chairman bu Jerome Powell n’ agbanyeghi nkato okatoro ya.

Omere ka amata na nkato ahu onyere ya bu iji me ka odiwaga uchu n’ olu ya okachasi dika osiri metuta ikpatughari aka n’ ihe banyere ego.

N’ okwu ya n’ ulo olu Oval Office unya bu Tuesday,ka President Donald Trump noro me ka amata na ya ka nwekwara olile anya ikwalite ezi udo mmekorita azum ahia nyere mba China.

Iga echeta etu President Donald Trump Siri noro n’ izu uka gara aga kato yabu onye isi oche nke US Federal Reserve ma n’ akpo ya onye dara ada. Ma buru nke kpatara ejiri refuo otutu akuru ngwa tinyekwara otutu ego dollar,kama na ngalaba n’ ahu maka ego azum ahia mba US ka ji nwayo akpachite ihe ndi ahu funariri ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited