Ochichi Ebonyi State Ekposala Otu Jikoro Ndi Na Azu Ahia Ewu Na Ala Ezza Nke State Ahu
Written by admin on February 28, 2026
by Maduabuchi Onwe
Government Ebonyi state ekposala otu ahu jikotara ndi na-azu ahia ewu na Onueke bu isi obodo Ezza South LGA amara dika Ezza North and Ezza South Goat Dealers Association nke State ahu. Nke a bu n’ihi nghotaghe nke ndoro ndoro ochichi tinyekwara ebubo nruru aka ego batara n’ime yabu otu
Nwa amadi ahu ji okwa commissioner na-ahu maka nkwanite oma ahia nakwa odu ugboala bu professor Nwogo Ajuka Obasi , mere ka nke a puta ihe na ngwucha nzuko ha nke weere onodu na etiti yana ndi ahu iwe di n’obi tinyekwara ndi jiburu okwa ochichi mgbe gara aga tinyekwara ndi nnochite anya nke otu Amalgamated Traders Union n’ ahia Eke lmeoha nke yabu Onueke.
Yabu onye commissioner gakwara na iru mere ka amata n’isi sekpu nti ejiri kposaa yabu otu bu n’ihi ebubo nruru aka nke ntuli aka ochichi tinyekwara akwubeghi aka oto na ihe gbasara ego na ya bu otu.
Kaosiladi, ahoputala otu committee mmadu ise mejuputara dika ndi gana hugodu ka ihe si aga na otu ahu ruo onwa ato oge ha ga achikoba ntuli aka ochichi ga agbasoro ezi usoro nkwuwa aka oto na state ahu wee hoputa ndi ga achi yabu otu jikotara ndi na azu ahia ewu na Ebonyi state.
Yabu otu committee nke onye isi ha bu maazi Usulor Godwin ka akuko mere ka amata na ha ga amalite oru na abali iri abuo na asaa nke onwa February, afo a bu 2026, dika ana atu anya ka ha hoputa ndi ohuru gana elekota ihe na eme na yabu otu ndi na azu ahia ewu tupu abali ano nke onwa March afo 2026.
Na ikpazu ka government Ebonyi state kwere nkwa igba mbo huna habu otu committee ruru oru ha etu okwesiri iji huna obu ihe ekwuru ka aga eme na yabu otu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.