INEC Eweputala Aha Ndi Na Azo Okwa Onye Isi Ala Nakwa Osote Ha Na Ntule Aka Ochichi Afo 2027
Written by admin on August 3, 2026
by Chika Nwazu
Ụlọọrụ Na-ahụ maka ntụli aka ọchịchị n’ala anyị bụ Independent National Electoral Commission INEC ekwuola na ha ewepụtala aha ndị ga-azọ ọkwa Onyeisiala na ndị ga-abụ osote ha maka ntuli aka ọchịchị izugbe nke afọ 2027.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi na akwụkwọ ndị ahụ dị na usoro akpọrọ Form EC9, anọrọla ugbua n’ụlọ ọrụ INEC dị iche iche n’ala anyị ka ụmụ afọ nwee ike ịgụ ma nyochaa ozi ndị dị na akwụkwọ ahụ.
INEC kwuru na ime nke a bụ iji gbasoro ihe iwu ntuli aka nke afọ 2026 kwuru nke na-enye ọhaneze ohere ịlele akwụkwọ ikike, nkọwa onwe onye na akwụkwọ nkwenye ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nyefere n’aha ndị ha họpụtara.
Ụlọọrụ ahụ kwukwara na e debere akwụkwọ ndị a n’ụlọ ọrụ ha niile dị na state yana okpuru ọchịchị ime obodo iji mee ka usoro ntuli aka bụrụ nke doro anya ma bụrụkwa nke onye ọ bụla nwere ike nyochaa.
Ka ọ dị ugbu a, ana-eme ka ndị mmadụ mata na INEC ka na-ekwupụta ozi gbasara ntuli aka site n’usoro mgbasa ozi ya nke government kwadoro, nke pụtara na ndị mmadụ kwesịrị ịdabere naanị n’ozi ụlọọrụ ahụ kwadoro.
