Ala Anyi Bu Nigeria Akpola Oku Ezi Onodu Yana Otu AUDA-NEPAD
Written by admin on July 30, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ala anyi bu Nigeria akpola oku gaara otu African Union Development Agency-New Partnership for Africa’s Development AUDA-NEPAD itinye nkwado na usoro African Demographic Dividend Programme nakwa atumatu mmepe na ala anyi a ma elegara anya na ubara onu ogugu ndi ntorobia nakwa uto Nigeria.
Okpukpo oku a putara ihe site na onu Minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu na nzuko onwere nyere onye Chief Executive Officer yabu otu AUDA-NEPAD bu Nardos Bekele-Thomas na ogbako African Union Executive Council Meeting na Addis Ababa bu isi obodo mba Ethiopia.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi taata bu Thursday ka onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Eze ka Amb Odumegwu-Ojukwu kwunworo mkpebi ala anyi nyere irukorita olu gaara otu AUDA-NEPAD iji kwalite ohere akuluba, obodo nakwa mmepe toro ato, ebe oyoro otu a ka ojiri ihe banyere odimma umunwaanyi, nkwalite ngalaba ndi nkiti nakwa mmekorita nyere ulo olu National Focal Office dina Abuja kporo mkpa.
Na oge ona eto otu a maka ichuta ego di otu nari nde Dollar gaara usoro African Demographic Dividend Programme nakwa ikwalite ntinye na olu nke atumatu African Union’s Agenda 2063 ka Amb Odumegwu-Ojukwu kwere nkwa nnogidesi ike nkwado na ntinye oke ala anyi gaara usoro mmepe otu a jigasi na aka.
Na nke ya ka yabu onye Chief Executive Officer otu AUDA-NEPAD bu Bekele-Thomas kwunworo mkpebi nkwado gaara usoro mmepe ala anyi, ma kwuputa olile ikwalite udo mmekorita nke nkeputa ohere akuluba nakwa atumatu oma ndi ozo.
