Umahi Ajuola Inabata Oku Ahu Ndi Mmadu Na Akpo Ka Achuo Ya Na Okwa Dika Onye Minister Na Nigeria
Written by admin on August 3, 2026
by Maduabuchi Onwe
Onye minister na ahu maka oru na Nigeria bu Engr. David Nweze Umahi ajuola inabata oku ahu ndi mmadu na akpo ka achuo ya na okwa oru ya kwere maka onwu nwada Mary Habila bukwanu onye nke nwuru na ebe obibi senator Umahi na odi nso a.
Na nzaghachi ya gara ufodu umu afo ala anyi bu Nigeria bukwanu ndi na akpo yabu oku ka achuo nwamadi ahu na okwa oru ya, ka Engr. Umahi mere ka amata na onye isi ala anyi bu president Bola Ahmed Tinubu enyego ya ikikere ka ya ga n’iru wee na aru oru ya etu okwesiri na enweghi ihe okpobi ukwu obuna na Nigeria.
Na ikpazu ka ozi mere ka amata na nwamadi ahu chiburu Ebonyi State bu Engr Umuahi enweghi ihe okwuru gbasara nnyocha ahu ana eme iji choputa ihe butere onwu nwada Habila na Ebonyi State.
Iga echetazi na nwada Habila nwuru na ebe obibi senator Umahi nke dina ime obodo Uburu na okpuru ochichi ime obodo Ohaozara nke dina Ebonyi state na abali iri abuo na asaa nke onwa June afo a bu 2026.


