Mmekorita Mba Na Ibe Ya: Nigeria Ekwunwuola Mkpebi Ya Nyere Nkwalite Ezi Udo Mmekorita Yana Mba Israel
Written by admin on August 4, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ochichi etiti ala anyi ekwunwuola mkpebi ya nyere ikwalite ezi udo mmekorita yana mba Israel dika osiri metuta ngalaba ndi gunyere: nchekwa, olu ugbo, ezi onodu nri, nka na uzu, aka nka ogbaru ohuru, aruike nakwa ezi onodu azum ahia.
Nke a putara ihe na onu Minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu na njem gaa nke oma akporo valedictory visit onye nnochite anya mba Israel na apu apu na ala anyi bu Amb Michael Freeman megara ya na isi ulo olu ministry ya dina Abuja.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi unya bu Monday bu onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Ezeh ka omere ka amata na Amb Odumegwu-Ojukwu toro yabu onye nnochite mba Israel na apu apu maka ezi mbo ya nyere nkwalite udo mmekorita ala anyi nakwa Israel na oge onona okwa.
Na oge ona ekwu maka nnaputa ahu anoro na odi nso a bu ndi nchekwa ala anyi naputa umuakwukwo ahu atoro na Oriire LGA nke Oyo State site na mkpebi ochichi President Bola Ahmed Tinubu nyere ezi onodu nchekwa, ka Amb Odumegwu-Ojukwu kwuru maka njiko aka na olu ala anyi a nakwa mba Israel na ihe metutara ozi oje na mmuo nchekwa, ibu agha megide agha isi ekwe onwu, nchekwa ego nakwa ikpochapu agwa ekperima onodu okere ala na ibe ya nke Nigeria nakwa Israel.
Na nke ya ka yabu onye nnochite anya mba Israel na apu apu bu Amb Freeman kwuputara mkpebi mba ya nyere mmekorita gaara ala anyi na ngalaba aka nka ogbaru ohuru, olu ugbo, aruike, nchekwa, mmuta nakwa nkwalite aka olu.
Na oge ona akowa ala anyi dika opuru iche, ka Amb Freeman mere ka amata na ume azum ahia ala anyi nakwa mba Israel no ugbu a na ihe dika nari nde Dollar abuo (yabu; 2 Hundred Million US Dollars), ma buru nke di onu ala karie ka okwesiri, ebe okwuputara olile anya ya sina mba abuo a ga aruko olu nyere ikwalite yabu mmekorita azum ahia na afo ndi dina iru.


