Otu Ndorondoro NDC Agbapela Mmalite Achum Nta Nkwado Ya Maka Ntule Aka Okpuru Ochichi Ime Obodo Ga Ewere Onodu Na Enugu State

Written by on August 4, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onye isi oche otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC na Enugu State bu Dr Johnpaul Anih anorola taata bu Tuesday duru ndi nchikwa State Working Committee otu ndorondoro a wuchie Aninri LGA ma gbape mmalite achum nta nkwado yabu otu ndorondoro maka ntule aka okpuru ochichi ime obodo ga ewere onodu na State a na abali iri abuo na isii nke onwa September afo a bu 2026.

Na okwu ya na ogbako mgbape mmalite achum nta nkwado a gaara onye ga eji okoloto yabu NDC zoo okwa onye isi oche Aninri LGA bu Hon Edward Onu Nwonye nakwa ndi nke ga azo okwa Councillors ka Dr Johnpaul Anih kwuputara ntukwasa obi ya nyere ohere NDC ituru ugo na yabu local govt elections, ma kowa ubara onu ogugu ndi nuputara na igwe bia ogbako a dika mgbaama gosiri na umu afo Aninri LGA ahorogo otu ndorondoro a dika nke kara ha mma maka ezi ndi ndu.

Na oge ona ayo ndi otu ndorondoro a ka ha ga na iru na ezi onodu idiko na otu nakwa irusi olu ike maka nturu ugo, ka Dr Anih doro aka na nti gaara otu ndorondoro nona isi ugbo ochichi State a megide myija ndi na atu akwukwo ntule aka ma obukwanu nruru aka na udi obuna megide yabu ntule aka ochichi.

Yabu onye isi oche otu ndorondoro NDC na Enugu State kwere umu afo a nkwa sina ndi ji okoloto otu ndorondoro a azo okwa ochichi nwechara mgbo eji agbagbu adaka dika osiri metuta ezi ochichi ma aroputa ha.

Na nke ya ka onye ahu ji okoloto otu ndorondoro a azo okwa onye isi oche Aninri LGA bu Hon Edward Onu Nwonye kenere ndi ndu yabu otu ndorondoro na ogogo State nke Dr Johnpaul Anih nona isi ha maka nkwado hana enye habu ndi na azo okwa, ma kwe nkwa ezi ochichi, ọkachasị na ngalaba ndi gunyere: olu ngo, aruike, agum akwukwo, nkwalite ndi ntorobia, olu ugbo nakwa mmepe imime obodo ma oburu na aroputa ya.

Na otu aka ahu ka onye isi oche NDC na Aninri LGA bu Hon Stephen Ajah noro na oge ona ekene habu ndi ndu otu ndorondoro kwuputa mmasi obi ike nturu ugo na yabu ntule aka okpuru ochichi ime obodo, ebe ihe kachasi puta ihe na ogbako a bu iche na iru ndi mmadu, ndi ahu ji okoloto otu ndorondoro a azo okwa.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited