Umunwaanyi Egwuregwu Ball Ala Anyi Azoola Ogbo Ha Umunwaanyi Mba Egypt Ka Akwu Na Asompi Iko 2026 WAFCON
Written by admin on August 6, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu egwuregwu Super Falcons umunwaanyi ala anyi azola ukwu dimkpa site na iji okpu goal isii asatara naani abuo bie ogbo ha umunwaanyi mba Egypt aka ojo na aru na abali gara aga na asompi iko Women’s Africa Cup of Nations WAFCON na aga na iru na mba Morocco.
Mmeri a habu umunwaanyi ala anyi nwetara emego ala anyi inafere na ogogo Group stage ma gbago na ogogo agbacha agba nke na esote nke ikpeazu akporo quarter finals.
Yabu nturu ugo biara site na okpu goal izizi nwada ala anyi bu Asisat Oshoala buru uzo nyeta na agba nke mbu, ebe nwada Gift Monday noro na nkeji iri ise na ise na agba nke abuo nyeta okpu goal nke abuo, Uchenna Kanu noziri na nkeji iri asato na otu nyeta okpu goal nke ato, ebe Chidimma Ucheibe noro na nkeji iri asato na ano nyeta okpu goal nke ano.
Rasheedat Ajibade nakwa Joy Omewa gara na iru na nkeji mgbakwunyere nyeta okpu goal nke ha na otu na otu mere ala anyi ji okpu goal isii chara acha asatara abuo dula Egypt na yabu asompi..
Na otu aka ahu ka mba Zambia ji okpu goal abuo asatara otu merie mba Malawi na abali gara aga.
Ka osiladi, ala anyi bu Nigeria ga anoro na ubochi uka bu abali iteolu nke onwa a bu August ma okuo elekere isii nke mgbede zute mba Cameroon na ogogo quarter finals



