Ochichi Ebonyi State Akwatuola Ulo Elu Na Abakaliki Bu Isi Obodo State Ahu
Written by admin on August 12, 2026
by Maduabuchi Onwe
Government Ebonyi state akwatuola otu ulo elu na Abakaliki bu isi obodo state ahu, dika omere ka amata na otego aruru yabu ulo nke mere na onozi na ajoo onodu na state ahu.
Nke biara dika Commissioner na ahu maka nkwalite nakwa mmepe isi obodo state ahu bu Hon. Richard Ugo Idike nochara na onwa July afo a bu 2026 wee kwuputa na yabu ulo bu nnukwute onya onwu diri ndi mmadu.
Hon. Idike meziri ka amata na yabu atumata bu iji gbochie ndi mmadu na ihe mberede ulo odida nakwa otutu ihe mberede ndi ozo ga edula ha mmuo na ike.
Iga echetazi na yabu onye Commissioner noro na mbu na onwa July wee nye iwu gara ndi nille bi na yabu ulo ka ha jiri abali iri abuo na otu zuru oke ga chota ebe ozo ha ga ebi, tupu ha wee malitezie ikwatu yabu ulo dika abali iri abuo na otu gasiri.

