Aka Akpatala Ndi Mgbere Ogwu Ike Na Anambra State
Written by admin on August 12, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ndi uwe ojii ala anyi na Anambra state anwuchiela mmadu abuo ana enyo enyo na habu ndi otu mgbere ogwu ike na Idemili North local government area nke state ahu.
Nke a putara ihe site na onu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii na state ahu bu SP Tochukwu Ikenga na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Tuesday na Awka.
Habu ndi otu mgbere ogwu ike mmadu abuo gunyere: Nzube Onyedikachukwu amakariri dika Onyeoma, gbara afo iri ano na asaa nakwa Ugochukwu Azia gbara afo iri abuo.
Na ikpeazu ka ha meziri ka amata na ha naputara habu mmadu abuo ukwutukwu ogwu ike ndi gunyere: cannabis, mkpurummiri bu methamphetamine nakwa otutu ogwu ike ndi ozo onu ego ya ruru nde naria isii na uma abuo.
