Agha Mba America Nakwa Israel Na Ebu Megide Mba Iran Na Mpaghara Middle East Agala Na Iru Na Ajo Onodu Amaghi Ihe Echi Ga Abu

Written by on March 26, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Mba United States of America adola mba Iran aka na nti ka okweta na emerigo ya na agha ahu yabu mba America jikoro aka yana Israel ebuso mba ahu mejuputara na ndi okpukpere uka Islam.

Nke a ka America yiri egwu sina oga akwara Iran oke nkwa onwu karie ka omegoro na mbu ma oburu na mba ahu aju ikweta na emerigo ya na agha a.

Na aka nke ya ka mba Iran juru kpamkpam ihe obuna bu atumatu ububo udo yana mba America, ebe okwere nkwa iga na iru na agha a na ada na mpaghara Middle East.

Yabu agha ka akowara na okana ari elu oji dika Iran gara na iru jiri ngwa ogu missiles akusugasi mpaghara etiti nakwa ndida ugwu mba Israel.

Na otu aka ahu ka ndi agha mba Israel buru nnukwu agha banye obodo amara dika Isfahan City dina etiti mba Iran ma suo otutu ndi mmadu akwu gunyere akuluba alara na iyi.

Ndi agha Israeli Defence Forces gakwara na iru wakpo mpaghara Nabatieh dina ndida ugwu mba Lebanon ma kpa ike di egwu site na ibi otutu ndi mmadu aka ojo nakwa ulo na akuluba ndi mmadu ha ji ugboagha Israeli Fighter Jets suo akwu unya bu Wednesday.

Na okwu ya ka onowu na okwa Prime Minister mba Israel bu Benjamin Netanyahu mere ka amata na ndi agha ya ga anogidesi ike na mbawanye agha hana ebu na ndida ugwu mba Lebanon.

Benjamin Netanyahu nuziri iyi agha mkpochapu megide ndi isi ochichi nakwa ndi agha mba Iran.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited