Aka Akpatala Onye Nkuzi Mara Obere nwagbobia Elu Na Ike Na Lagos State

Written by on July 27, 2026

by Maduabuchi Onwe

Akpupuola otu onye nkuzi enyere aha ya naani dika Michael ulo ikpe megistrate court nke ji Ogudu na Lagos State wee mere isi onodu maka imeto obere nwagbobia gbara afo iri na ise na state ahu.

Yabu nwamadi ka ndi uwe ojii ala anyi na Lagos State mere ka amata na ha nwuchiri na abali iri na ato nke onwa July afo 2026, mana omechara wee nwee obi ida mba bukwanu ihe mere eji wee hapuzia ibuga ya ulo nga wee bugazie ya ulo ogwu na state ahu.

Kosiladi, ha gakwara na iru mee ka amata na nwamadi ahu esigo ulo ogwu wee gawazie ulo nga lkoyi correctional center bukwanu ebe oga noo wee ruo ubochi yabu ulo ikpe ga elebaghari anya na yabu ikpe na state ahu.

Na ikpeazu ka ulo ikpe mere ka amata na ha ga elebanya na ikpe nwamadi ahu na abali iri abuo na ano nke onwa Augusta afo a bu 2026.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited