Aka na achi Delta State ekwuputala obi nwute ya gbasara ọnwụ nwa amadi ahụ jibu ọkwa onye isi ala anyi a.
Written by Onyinye on July 14, 2025
Aka na chi Delta State bu Governor Sheriff Oborevwori, ekwuputala obi nwute ya gbasara ọnwụ nwa amadi ahụ jibu ọkwa onye isi ala anyi bu Late President Muhammadu Buhari, ebe ọ kọwara ọnwụ ahụ dika nke na agbawa obi gara ezinụlọ ya, ndị agha ala anyi nakwa ụmụ afọ Nigeria n’izugbe ya.
N’ozi putara ihe site n’aka odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bu Sir Festus Ahon ụnya bu Sunday, Governor Oborevwori kwuru na Late Former President Muhammadu Buhari biri ezigbo ndụ ma tinye uchu iji weta ịdị n’otu nakwa ọganiru na ala anyi a bu Nigeria.
Governor Oborevwori gara n’iru mee ka amata na ọchịchị ya nakwa ụmụ afọ State ahụ na eri ụjọ gbasara ọnwụ Late Former President Muhammadu Buhari, dika onye biri ezigbo ndụ ma ruọ ezigbo ọrụ na ala anyi bu Nigeria.
Ọ gara n’iru kasịe ndị agha ala anyi, ụmụ afọ Katsina State nakwa ala anyi bu Nigeria gba gburugburu obi maka yabụ ọnwụ Late Former President Muhammadu Buhari.
Dika ọ kpere ekpere ka Chukwu Okike Abiama nabata mkpụrụ obi ya ma nye ezinụlọ ya obi ndidi ha ga eji diye yabu ọnwụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.