Aka na achi Kebbi State akpọkuola ụmụ na eto-eto na State ahụ gba gburugburu ka ha gba mbọ mụọ ọrụ aka.
Written by Onyinye on July 28, 2025
Aka na achi Kebbi State bu Governor Nasir Idris, akpọkuola ụmụ na eto-eto na State ahụ gba gburugburu ka ha gba mbọ mụọ ọrụ aka dika ụzọ ha ga eji na akpata ego ma na enyekwara onwe ha aka.
Governor Idris kpọrọ oku a ụnya bu Sunday n’oge mmemme 2025 Kebbi State Youth Cultural Event bu nke were ọnọdụ na Umaru Waziri Federal Polytechnic, Birnin Kebbi.
Mmemme a nke isi okwu ya bu “Let’s Unite and Showcase Our Tradition” n’asụsụ bekee bu nke Kebbi State Youth Development Association na njikọ aka Ministry of Information and Culture nke State ahụ nakwa Nafisa Nasir Charity Development Foundation chikọbara ya.
N’okwu ya ka nwa amadi ahụ nọchitere anya Governor Idris bu Commissioner n’ahụ maka ọrụ bu Faruk Muslim, mere ka amata na imụ ọrụ aka abughi nani maka ọdị mma nke onwe, kama na ọ bụkwazi maka ọdị mma nakwa mmepe nke State ahụ.
Dika ọ gara n’iru kwuputa njikere government State ahụ dị ikwado ma walite ụmụ ntorobịa nakwa ụmụ nwanyi na ọrụ dị iche iche.
N’okwu nke ya, ka nwunye aka na achi State ahụ ma burukwa onye chọpụtara Nafisa Nasir Charity Development Foundation bu Hajiya Nafisa Nasir Idris, toro ndị chikọbara mmemme ahụ, ebe ọ kọwara ya dika ezi atụmatụ.
O kweghachiri nkwa njikere otu ya dị iji kwado ma kwalite ụmụ ntorobịa nakwa ụmụ nwanyi n’ọrụ aka dị iche iche, dika ọ gara n’iru kọwaa na dị ya na agba mbọ iji hụ na ha ketara oke na atụmatụ government State ahụ ji n’aka.
N’aka nke ya, ka Commissioner n’ahụ maka ozi bu Alhaji Yakubu Ahmed-BK, kọwara na oke n’ọrụ dịrị omenani bu iweta udo, ịdị n’otu nakwa mmepe, dika otoro mmemme ahụ bu nke na akwalite omenani ha ọkachasi Argungu Fishing Festival dika otu n’ime njirimara State ahụ.
Onye isi oche Kebbi Youth Development Association bu Mubashir Mohammed, kenere government State ahụ n’ebe ọdị ukwu maka ịnye ha ezi ọnọdụ ka mma iji merube yabu mmemme, ma kenekwa nwunye aka na achi State ahụ maka nkwado na nkwalite nke ụmụ ntorobịa nakwa ụmụ nwanyi na State ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.