Aka Ndị Uwe Ojii Na Osun State Akpatala Mmadụ Irị Na Asatọ Ana Enyoenyo N’okwu Gbasara Wwakpo Emere Ndị Uwe Ojii Na State ahụ
Written by admin on March 30, 2026
by Chidimma Kama
Aka ndị uwe ojii ala anyị na Osun State akpatala mmadụ ịrị na asatọ ana enyo enyo ma nwetakwa ọtụtụ ngwa ọgụ gbasara mwakpo emere ndị uweojii ala anyị n’ọdị nso a na Erin-Osun nakwa Ilobu communities dị na Osun State.
Yabụ ndị ana enyo enyo bụ ndị ozi kọwara na ha gbara ọsọ ga zoo onwe ha dịka ha kpachara agwa ọjọ ahụ mana aka ha bụ ndị uweojii mechara kpata ha site na nyocha ka na aga n’iru k’ọdị ugbua.
Nkea pụtara ihe ụnya bụ ụka site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere habụ ndị uweojii na State ahụ bụ DSP Abiodun Ojelabi, dịka ọ kọwara na Commissioner ndị uweojii bụ CP Ibrahim Gotan, ghaziri usoro nyocha pụrụ iche bụ ụzọ esịrị nwụchikọ ndị ahụ ana enyo enyo.
Yabụ onye Police Public Relations Officer PPRO gara n’iru mee ka amata na sitekwa na nyocha ahụ na ndị uweojii nwuchikwara ndị ọzọ ana enyo enyo na aka ha dị na agwa ọjọ ahụ.
DSP Ojelabi gbakwụnyere na ihe ndị uweojii a chọtara n’oge ha nọ ọrụ ahụ gụnyere: otu egbe single barrel gun, otu mgbo egbe dị ndụ nakwa otu nma ukwu, ebe ndị ahụ ana enyo enyo gụnyere: community leaders nakwa ndị bị n’obodo Erin-Osun nakwa Ilobu, nọcha n’agbata afọ ịrị na anọ ruo afọ ịrị ịsịị na ịse, o mekwara ka amata na nyocha ka na aga n’iru iji nwụchikọ ndị ọzọ aka ha dị n’ọba ahụ ekere ede.
Ebe aha ndị ahụ aka akpatara gụnyere: Olaitan Bashiru, gbara afọ ịrị ịse na atọ, Baale of Apeponroro, Tajudeen Aralamo, gbara afọ ịrị ịsịị na ịse, Baale of Oke Ayepe, Mustau Salam, gbara afọ ịrị anọ na ịse, Oluode of Ilobu, Jimoh Nurudeen, gbara afọ ịrị abụọ, Adeboye Ashifa, gbara afọ ịrị ịsịị na atọ, Ajibola Segun, gbara afọ ịrị anọ, Mustapha Muwaliu, gbara afọ ịrị atọ na asatọ, Jimoh Quyum, gbara afọ ịrị abụọ na ịsịị, Ajani Faruq, gbara afọ ịrị abụọ, Musibau Jimoh gbara afọ ịrị atọ na ịse, tinye kwara ọtụtụ ndị ọzọ.
Habụ ndị uweoji gara n’iru kwupụta njikere ha dị itinye uchu n’ọrụ iji nye nchekwa gara ndụ ndị mmadụ nakwa ihe ha nwere ma chụọ ndị ekperima ọsọ ụkwụ eruala na State ahụ.
Ha gakwara n’iru riọ ọhaneze ka ha nyere ndị ọrụ nchekwa aka site n’inye ha ozi ga abara ha uru na nyocha ahụ n’aga n’iru, gbakwa mbọ kpọtụrụ ndị uweojii mgbe ọbụla ha hụtara ije agwọ na gburugburu ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.