Akpọla aha otu obodo dị na mba China dịka ebe a kacha emepụta ntutu isi adigboroja nke ụmụ nwaanyị akpọrọ wig.
Written by Onyinye on June 19, 2025
Obodo Xuchang nke dị na mpaghara Henan province nke mba China abụrụla ebe amara n’ụwa niile dịka ebe a kacha emepụta ntutu isi adigboroja akpọrọ wig nke ruru percent iri isii ụmụ nwaanyị na ekpu n’isi ha n’ụwa niile gbaa gburugburu.
N’obodo ahụ ka enwere ụlọrụ na emepụta ya nke ruru puku anọ na otu narị. Ebe ndị ọrụ ha ruru narị puku atọ.
Ọtụtụ n’ime akọrọ ngwa ahụ ka e kwuru na ọ bụ ntutu mmadụ ka ejiri mee ya. Obodo Xuchang ka e kwuru na ha amalitela ime wig ihe ruru ọtụtụ narị afọ gara aga.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.