Alhaji Atiku Abubakar nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP anọrọla ụnyaahụ bụ Monday were zute aka chiburu ala anyị n’oge gara aga bụ Olusegun Obasanjo.
Written by admin on February 11, 2025
Alhaji Atiku Abubakar nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP anọrọla ụnyaahụ bụ Monday were zute aka chiburu ala anyị n’oge gara aga bụ Olusegun Obasanjo.
Atiku duru ndị otu ya ndị ọzọ were zute nwa amadi ahụ na be ya dị na Abẹ́òkúta bụ isi obodo Ogun State.
Ndị yana nwa amadi ahụ jibu ọkwa osote onyeisi ala Nigeria n’oge gara aga soro mee njem ahụ gụnyere aka chiburu Cross River State bụ Liyel Imoke, Sen Aminu Tambuwal chiburu Sokoto state yana ọtụtụ ndị ọzọ.
Ihe ha jiri mee ya bụ njem bụ nke ana emebeghi ka ọ pụta ihe mana a na-atụ anya na o nwere ike ị bụ mbọ ha n’agba ị weghara ọkwa ọchịchị nke onyeisi ala Nigeria site n’aka otu ndọrọndọrọ All Progressives Congress na ntụliaka izugbe nke afọ 2027.
Na ọ dị nso a ka ya bụ Atiku Abubakar nọkwara lee ogbo ya nke otu ndọrọndọrọ Labour Party bụ Mazi Peter Obi ọbịa n’ụlọ ya dị na Adamawa State.