Amb. Bianca Odumegwu-Ojukwu Enyela Nkowa Uru Na Elele Putagasiri Na Njem Ahu President Tinubu Megara Mba UK

Written by on March 24, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Minister ogo nta ala anyi na ahu maka mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu emela ka amata na njem ahu President Bola Ahmed Tinubu noro na odi nso a mega na mba United Kingdom amakwuru dika mba Britain bu nke mitara mkpuru puru iche nyere ntiteghari ezi udo mmekorita ala anyi nakwa yabu mba UK okachasi dika osiri metuta akuluba, azum ahia nakwa nchekwa.

Amb Odumegwu-Ojukwu mere ka nke a puta ihe na Abuja site na ozi onye enyemaka puru iche ya na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Ezeh nyefere ndi nta akuko.

Na ozi a ka yabu Minister kowara President Tinubu dika onye isi ala nke ise kemgbe Nigeria malitere ana anabata na udi nkwanyere ugwu njem a na mba Britain ma burukwa onye isi ala nke izizi kemgbe afo iri ato na asaa ka odi ugbu a na aga yabu njem State Visit na mba ahu.

Okwuputara na njem a gaara King Charles mitara mkpuru nke udo nkwekorita Port Partnership ego di nde nari Pounds asaa, iri ano na isii nakwa nkwalite azum ahia, nchekwa gunyere nka na uzu na etiti ala anyi na yabu mba UK.

Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu sitere na ozi a Dr Magnus Ezeh nyefere ndi nta akuko kowa na President Tinubu noro na njem a kpoturu onowu na okwa Prime Minister bu Sir Keir Starmer ma buru nke nyere ohere ikpa maka ntunye ego na akuluba okachasi na ebe ometutara ngwuputa aku onatarachi ime ala, ikikere oku na mmanu, olu ugbo, nruputa akuru ngwa nakwa otutu ihe oma ndi ozo na etiti ala anyi a bu Nigeria nakwa mba Britain.

Yabu Minister kowara na ezi onodu akuko ala anyi, aka nka nakwa omenala Nigeria noro na njem a onye isi ala megara mba United Kingdom gbago ogogo mba uwa.

Okwuputara na anoro na njem a gosiputa aka olu opuru iche umu afo ala anyi ma buru ebe President Tinubu noro too ha maka mbo ha nyere uto na mmepe ngalaba aka nga bu Creative Sector.

Na ikpeazu ka Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu mere ka amata na osote onowu na okwa Deputy Prime Minister mba Britain bu David Lammy noro na ogbako nnabata a nyere President Tinubu kowa mkpa ezi udo mmekorita ala anyi nakwa yabu mba UK.

Iga echetazi na President Bola Ahmed Tinubu nakwa nwunye ya bu Sen Oluremi Tinubu ka anoro na abali iri na asato nakwa iri na iteolu nke onwa a bu March afo 2026 lee obia nke nkwanyere ugwu puru iche na obi eze King Charles nke mba Britain na mpaghara ya nke Windsor Castle, ebe onye isi ala mechaziri kpoturu onowu na okwa Prime Minister bu Sir Keir Starmer na obi ochichi mba ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited