America Adoola Aka Na Nti Maka Odachi Ngaghari Iwe Na Nigeria

Written by on March 4, 2026

by Chika Nwazu

Ụlọ nnọchiteanya mba United States of America dina Abuja adọla ụmụ afọ ha aka na ntị ka ha kee nkwụcha kworo maka ngagharị iwe ha kwuru na ana akwado ịchịkoba na Abuja.

N’ozi ulo olu a zipụrụ na ọwa ozi mmekorita ohaneze na ubochi Wednesday ka okwuru na ha ahụla ihe mgbaàmà na egosi na ndị mmadụ nwere ike ime ngagharị iwe ahụ kworo maka agha yabu mba America nakwa Israel na ebu na mba Iran.

Omere ka amata na udiri ngagharị iwe a emegoro n’oge gara aga bụ nke esemokwu mechara si na dapụta n’etiti ndị iwe dị n’obi nakwa ndị ọrụ nchekwa.

Ahutakwara na yabu ulo olu United States Embassy na ala anyi mechara kagbuo ndị niile hana ha nwere azụmahịa nke ịbịa gbata akwụkwọ visa na aka ha taata na Abuja.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited