Anwuchiela Di Na Nwunye Na lmo State Maka Itu Mgbere Ogwu Ike Na State Ahu.
Written by admin on March 30, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ndi uwe ojii ala anyi na lmo state anwuchiela di na nwunye ana enyo enyo maka itu mgbere ogwu ike na state ahu.
Habu di na nwunye enyere aha ha dika Collins lwunze gbara afo iri ise na otu nakwa nwunye ya bu Onyinyechi Iwunze gbara afo iri ano na ato ka anwuchiri na ubochi Friday na bee ha dina Umunjoku Obiokwu nke dina Amakohia-Ubi nke Owerri west local government area na Imo state.
Nke a putara ihe site na ozi onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu DSP Henry Okoye nyefere ndi nta akuko na ubochi Saturday na state ahu.
DSP Henry Okoye gakwara na iru mee ka amata na ha naputara habu di na nwunye ukwutukwu ogwu ike digasi ichiche nke ha na eregasi ndi mmadu na state ahu.
Kosiladi, habu di na nwunye ka ozi mere ka amata na ha nozi na aka ndi uwe oji ka odi ugbu a dika nnyocha ka na aga na iru ikpupu ha ulo ikpe.
Na ikpazu ka commissioner ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu CP Audu Garba Bosso kelere ndi uwe oji state ahu maka oru oma ha ikwusi agwa ekperima kpam kpam na state ahu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.