APC Anuola Iyi Inapu APGA Ike Ochichi Anambra State

Written by on September 25, 2024

By Moses Nnabuife Nwekwu

Otu ndorondoro All Progressives Congress APC n’ ogogo etiti ala anyi anuola iyi igbasoro usoro ahu ojiri napu ikike ochichi Edo State n’ aka otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP were napukwuo ya n’ aka otu ndorondoro All Progressives Grand Alliance APGA na ntule aka ochichi Governorship Election aga achikoba na Anambra State afo ozo bu 2025.

Otu ndorondoro a kowakwara n’ oga eturu ugo na ntule aka ochichi Governorship Election aga achikoba na Ondo State n’ onwa November nke afo 2024 anyi nona ime ya.

Obu onye isi oche izugbe otu ndorondoro APC n’ ala anyi bu Dr Abdullahi Umaru Ganduje mere ka nke a puta ihe n’ ubochi Monday na Abuja oge ona agwa ndi nta akuko okwu banyere nturu ugo otu ndorondoro a na Edo State.

Abdullahi Umaru Ganduje kwuputara n’ obughidi naani Anambra State ka otu ndorondoro APC ji atumatu n’ aka iweghara kama, States niile enwere na mpaghara owuwa anyanwu nke ndida ugwu ala anyi amara dika South East.

Yabu onye APC National Chairman gwara ndi nta akuko n’ otu ndorondoro a ga anapu otu ndorondoro PDP ike ochichi Enugu State ma napukwuo Labour Party ike ochichi Abia State na ntule aka ochichi ozo aga achikoba n’ odiniru.

Nwa amadi a yoro ndi ndu otu ndorondoro APC n’ ogogo niile ka ha kwalitekwuo ume olu ha iji huna APC napuru State niile dina mpaghara South East kwere maka ihe okowara mpaghara ala Igbo dika ebe di oke mkpa nyere yabu otu ndorondoro.

Iga echetazi na ka odigodu ugbu a n’ obu otu ndorondoro APC bu otu ndorondoro kana onu ogugu na mpaghara South East kwere maka n’ otu ndorondoro a nona isi ugbo State abuo ndi gunyere: Ebonyi nakwa Imo.

Otu ndorondoro PDP bu naani Enugu State ka onona isi ugbo na South East, ebe Labour Party bu naani Abia State ka oji aka, dika otu ndorondoro APGA bu naani Anambra State ka oji ike ochichi ya.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies