Atuola Otu Dibia Anya Nzu Ama-ama Nga Na Anambra State

Written by on February 28, 2026

by Maduabuchi Onwe

Ulo ikpe Anambra state High court nke ji Awka bu isi obodo state ahu wee mere isi onodu atuola otu onye dibia odinala enyere aha ya dika Chidozie Nwangwu amara nke oma dika Akwaokuko Tiwara Aki nga onwa iri na otu zuru oke na yabu state.

Akwaokuko Tiwara Aki ka ozi gakwara na iru mee ka amata na aturu ya nga afo iri na abuo kwere maka agwa ekperima di isii na onuogugu okpara na state ahu.

Nke a putara ihe na nkabi ikpe onye okaikpe ulo ikpe state ahu bu justice Jude Obiora kabiri gbasara nwamadi ahu na odi nso a.

Kosiladi, ulo ikpe Anambra state high court gakwara na iru nye iwu ka etikpo ogige ebe nwamadi na anobu wee na esi otumokpo dina Oba nke ldemilli South local government area na Anambra state.

Iga echetazi na yabu ulo ikpe mechara wee nye iwu ka Akwaokuko Tiwara Aki binye aka na akwukwo ma kwee nkwa na onweghizi ihe dika “Okite” na Anambra state.

Na ikpazu ka ulo ikpe mekwaziri ka amata na aga eme ya onye isi ndi ntorobia ma ogacha nga afo iri na abuo wee laghachite azu ka ojiri owa ozi mmekorita ohaneze ya wee na agbasara umu afo ala anyi na etolite etolite ozioma ka ha chegharia ma wepu aka ha na okite kwere maka na obu ihe jogburu udele ma sigbuo nkapi na uwa gba gburugburu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited