DOO DSS AKA NA NTI MEGIDE MWAKPO IKIKE DIARA ANYI – KA SERAP NA AGWA ONYE ISI ALA NIGERIA

Written by on September 9, 2024

Otu Socio-Economic Rights and Accountability Project SERAP, agwaala onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ka ome ngwangwa nye iwu gaara ndi nchekwa oje na mmuo Department of State Services DSS ka ha kwusi mmaja, mmegide nakwa nkusu nyere yabu otu nona isi ugbo maka izo ikikere diara umu afo Nigeria nyere akuluba ala anyi.

Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Monday na Abuja ka onye Deputy Director yabu otu SERAP bu Kolawole Oluwadare noro katosia ya ike bu mwakpo ndi nchekwa oje na mmuo DSS wakporo ogige isi ulo olu otu a dina Abuja taata.

Oluwadare boro ebubo si n’ obu okpukpo oku yabu otu SERAP kpokuru President Tinubu ka onye ulo olu Nigerian National Petroleum Company Ltd NNPCL ntuzi aka ka oweghachi mbugo ohuru ahu onoro n’ odi nso a bugokwuo onu ego mmanu ugboala ma mekwa nnyocha gaara ebubo agwa mpu n’ aru n’ aga n’ iru na yabu ulo olu NNPCL kpatara mwakpo a DSS megara ogige isi ulo olu otu SERAP taata.

########################

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies