ASUU Eyiela Egwu Imachi Agum Akwukwo Mahadum Na Imo Nakwa Anambra
Written by admin on June 30, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu

asuu-1
Otu jikoro ndi nkuzi mahadum akporo Academic Staff Union of Universities ASUU ngalaba ya nke Owerri Zone enyedebela aka na achi Imo State bu Gov Hope Uzodimma nakwa ogbo ya nke Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo abali iri na ano nke putara izu uka abuo ka ha tinye na olu nkwekorita otu ASUU nakwa ochichi etiti ala anyi nwere na afo 2025 gara aga maka odimma habu ndi nkuzi.
ASUU doziri aka na nti sina ha ga amalite abubo olu ana amaghi mgbe oga akwusi na habu State abuo ma oburu na Gov Uzodimma nakwa Soludo aju itinye yabu nkwekorita na olu.
Na ogbako ndi nta akuko were onodu unya a bu Monday na mahadum Nnamdi Azikiwe University UNIZIK dina Awka ka onye mkpokota na okwa Zonal Coordinator yabu otu ASUU nyere mpaghara Owerri Zone bu Dr Dennis Aribodor yiri egwu sina yabu abubo olu abughikwa naani mahadum ochichi etiti nwe na habu State abuo ka oga emetuta kama na oga emetutakwuo ma ndi nke State nwe bukwanu ndi gunyere: Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University dina Igbariam nke Anambra State nakwa Imo State University dina Owerri bu isi obodo Imo State.
Otaziri aka na eze megide ebubo ekweghi ekwe bu habu ndi Governors abuo itinye nkwekorita odimma ndi nkuzi mahadum ha na olu, dika okowara na mbo niile otu ASUU gbara iweta ogbugbo nyere onodu a kuchara afo na ala.
Nwa amadi a kowakwara na ulo olu National Universities Commission NUC ezigagoro ndi aka na achi State ozi maka nkwekorita a akporo 2025 Federal Government-ASUU Agreement, mana obuzi ihe di anaa n’aka na achi Anambra State nakwa ogbo ya nke Imo State ekweghi etinye ya na olu.