Francis Duru Nke Ngalaba Ejije Nollywood Anwuola
Written by admin on October 23, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu nwa afo ala anyi mere nke oma na imeputa ihe nkiri onyonyo na ngalaba ejije Nollywood bu Francis Duru arapula elu uwa a gawa iza oku chi kporo ya na bee ndi mmuo.
Nke a putara ihe na isi ututu taata bu Friday site na ozi ezinulo ya weputara na owa ozi mmekorita ohaneze bukwanu ebe anoro kowa na nwa amadi a nwuru dika oyachara aru obere oge.
Duru bu nwa afo Imo State ma buru onye amuru na mba Cameroon na abali iri abuo na asaa nke onwa July afo 1969 ka ozi kowara na onwuru dika ogbachara afo iri ise na asaa na elu uwa.
Ozi a gara na iru kowa na obu na afo 1989 ka nwa amadi a malitere imeputa ihe nkiri onyonyo, dika oguru akwukwo mahadum ya na University of Port Harcourt nke Rivers State ma nweta nzere mmuta Bachelor of Arts Degree.

