Government etiti anọrọla taata bu Thursday mechie ikpe onye ndu otu Indigenous People of Biafra.
Written by Onyinye on June 20, 2025
Government etiti anọrọla taata bu Thursday mechie ikpe ya na ikpe ahụ n’aga n’iru nke onye ndu otu Indigenous People of Biafra IPOB bu Mazi Nnamdi Kanu, na ebubo metụtara iyi ọha egwu nakwa ịgba ọchịchị mgba okpuru.
Onye ọkaikpe government etiti bu Chief Adegboyega Awomolo SAN, mere ka nkea puta ihe dika onye akaebe nke ise enyedebere aha ya dika EEE kwere maka nchekwa ya, bụ onye ọkaiwu na anọchite anya Kanu, bu Onyechi Ikpeazu, gbara ajụjụ ọnụ n’ihu Justice James Omotosho nke ụlọ ikpe Federal High Court dị na Abuja.
Awomolo gwara ụlọ ikpe ahụ na mgbe ha kpọchara ndị akaebe ise na okwu ahụ, na ndị ọkaiwu nwere afọ ojuju na site n’oke ihe akaebe gbara, gụnyere mgbasa ozi nke onye ndu IPOB, government emejuputala nke ọma mkpa ọ dị imechi ikpe ya.
Dika ekwuputachara mechie ikpe ahụ, onye isi ọkaiwu ndị na-ahụ maka okwu, bụ Chief Kanu Agabi, gwara ụlọ ikpe ahu na ha ga agba akwụkwọ maka enweghị ikpe, bụ nke a ga-agba n’oge n’adịghị anya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.