Government mba South Africa mere ka amata na ọdachi ụlọ elu ise ahụ dara ma gbuo mmadụ iri atọ bu nke ekwesiri igbochi.
Written by Onyinye on July 21, 2025
Government mba South Africa mere ka amata na ọdachi ụlọ elu ise ahụ dara ma gbuo mmadụ iri atọ na anọ bu ndi nọ ọrụ ebe ahụ bu nke ekwesiri igbochi.
N’ozi ọhụrụ putara ihe gbasara ọdachi ahụ bu nke site n’aka Minister n’ahụ maka ọrụ na mba ahụ bu Dean MacPherson kwuru na ụlọ ahụ dara kwere maka ejighi ezigbo akurungwa eji arụ ọrụ ụlọ.
Dika ọ gara n’iru kọwaa na achọpụtara na ụlọ ahụ adịghị mma otu afọ tupu ihe ọdachi ahụ eme, ebe ụfọdụ ndị ọrụ ji iwe gba alụkwaghim n’ọrụ ahụ mana yabu ọrụ gara n’iru, ọ kọwara na ekwesiri ịkwụsị ọrụ ahụ ngwa ngwa achọpụtara na ụlọ ahụ nwere ihe mkpọbi ụkwụ.
Onye Minister ahụ kpọrọ oku ka eme nyocha tọrọ atọ ma nwuchikọ ndị ahụ ji yabu ọrụ ụlọ, dika ndị uweojii na mba ahụ mere ka amata na ha amalitela nyocha ha mana onwebeghi onye ha nwuchiri.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.