Ihe mberede okporo ụzọ mere ụnyaahụ bụ Monday n’okporo ụzọ awara awara si Okene gaa Abuja ataala isi mmadụ asaa nke anọ n’ime ha bụ ụmụ akwụkwọ mahadum.
Written by admin on February 18, 2025
Ihe mberede okporo ụzọ nke metụtara ụgbọala opi ike bụ truck na Kogi state ataala isi mmadụ asaa nke gụnyere ụmụ akwụkwọ mahadum federal University Lokoja mmadụ anọ ebe ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Onye ji ọkwa sector commander nke ụlọrụ frsc na Kogi state bụ Mr Samuel Oyedeji bụ ya gwara ndị nta akụkọ nkea na Lokoja bụ isi obodo Kogi state bụ oge o kwuru na ụgbọala opi ike ahụ enweghịzi ike jide nwuo onwe ya aka.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ihe mberede okporo ụzọ ahụ mechara weta ihe mkpọbi ụkwụ nyere ndị njem n’okporo ụzọ ahụ si Okene gaa Abuja kpọmkwem na mpaghara Lokoja.
Nkea mere mgbe ụmụ akwụkwọ mahadum ahụ iwe jụrụ n’obi maka ọnwụ nke onye otu ha nuputara n’igwe bịa nọchie okporo ụzọ ahụ kpamkpam.
Ndị ahụ mmiri fara na eze gụnyere ụmụ agbọghọ atọ, otu nwa okorobịa yana nwoke ọzọ merụrụ ahụ.
Oyedeji kwuru na ụgbọala opi ike nke bụ osiso a wara awa sitere na ndịda ugwu ala anyị na-aga Abuja ejideghizi onwe ya aka ma kwofere na ọwara onye ọzọ gaa suo na ụgbọala shuttle nke bu ụmụ akwụkwọ federal University Lokoja kpọmkwem n’ebe akpọrọ felele n’oge ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere anọ nke mgbede.
Onye sector commander ahụ kwuru na onye ọkwọ ụgbọala shuttle bus ahụ yana onye ọzọ o bu n’ime ya so ná ndị nwụrụ anwụ mana ogbo ya nke ụgbọala truck ahụ riri mbọ mbọ iji zọro ndụ ya n’aka ụmụ akwụkwọ.