Ihe Mberede Okporo Uzo: Ufodu Ndi Mmadu Ezutela Onwu Ike Ha Na Oyo State
Written by admin on October 18, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Opekata mpe mmadu ise ezutela odachi onwu ike ha kworo maka ihe mberede okporo uzo mere na ogologo okporo uzo Iwo-Ojoo Expressway dina Ibadan bu isi obodo Oyo State unya bu Saturday.
Yabu odachi ka ozi kowara na omere oge nnukwu ugboala tanker mmanu diesel gara kuko isi nyere otutu ugboala ndi ozo nona yabu okporo uzo.
Na okwu ya ka onye General Manager ulo olu Oyo State Road Traffic Management Authority bu Adeoye Ayoade kowara na odachi a bu eziokwu.
Ayoade gwara ndi nta akuko na obu oke nkwakoju okporo uzo sitere na nnukwu ugboala trailer mebiri emebi na mpaghara ahu butere yabu ihe mberede.
Na otu aka ahu ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na yabu Oyo State bu Olayinka Ayanlade gwara ndi nta akuko na odachi a bu eziokwu mana Commissioner habu ndi uwe ojii na State ahu bu CP Abimbola Ayodeji Olugbenga enyego ntuzi aka iga olu nchekwa nakwa nnaputa ndi niile nke a metutara.


