Iran Akwala Nnukwu Nkwa Onwu Megide Mba Israel Na Agha Ahu Na Ada Na Mpaghara Middle East.
Written by admin on March 24, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Mba Iran anorola taata bu Tuesday gbakenye otutu ngwa ogu missiles na mba Israel ma buru nke butere oke odachi nakwa mmeru aru na Tel Aviv bu isi obodo yabu mba Israel.
Nke a na abia dika ajo onodu amaghi ihe echi ga abu dika osiri metuta olile anya inwe mkparita ububo na agha ahu na ada na mpaghara Middle East na akuzi afo na ala.
Ihe eserese ndi nta akuko hutara na egosi ike ojo habu ngwa ogu missile kpara megide mpaghara ano na yabu isi obodo mba Israel.
Na okwu ya ka onye Mayor nyere Tel Aviv bu Mayor Ron Huldai gwara ndi nta akuko na habu ngwa ogu nwetara ulo elu nwere mkpokwasa ato taata na isi obodo mba ahu.
Iga echetazi na obu kemgbe abali iri abuo na asato nke onwa February gara aga ka mba United States of America nakwa Israel jikoro aka malite ibu agha megide mba Iran ma buru nke tagoro isi puku kwuru puku ndi mmadu okachasi ndi isi ochichi nakwa ndi agha mba Iran.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.