Mahadum DUFUHS Nke Ebonyi State Enwetala Ubara Onu Ogugu Umuawkukwo Ohuru
Written by admin on March 9, 2026
by Maduabuchi Onwe
Onye Vice Chancellor ulo akwukwo mahadum ahu abara aha nwamadi chiburu Ebonyi state bu David Umahi Federal University of Health and Sciences DUFUHS dina Uburu nke okpuruochichi Ohaozara na Ebonyi state bu Prof. Jesse Uneke emela ka amata na onuogugu umuakwukwo mahadum ahu erugo mmadu di puku ano bukwanu ndi nke nozi na ogogo nke iguputa na yabu ulo akwukwo mahadum.
Nke a putara ihe site na onu nwamadi ahu dika ha na emerube mmeme inabata umuakwukwo ohuru na yabu ulo akwukwo na odi nso a.
Ogakwara na iru mee ka amata na umuakwukwo ha nabatara ohuru na yabu ulo akwukwo ka odi ugbu di otu puku mmadu na mmadu iri ano na ano, nke mmadu di nari ato na iri isii na otu bu umunwoke, ebe mmadu nari isii, iri asaato na ato bu umunwaanyi.
Prof. Uneke na nkowa ya mere ka amata na ihe mere onuogugu umu-akwukwo yabu mahadum ji wee na agbago kwa ubochi bu kwere maka nkuzi ihe nke bu opuru iche ana enye umuakwukwo na yabu ulo akwukwo.
Ogbakwunyekwara na ha achigo umuakwukwo di iri abuo na iteolu na yabu mahadum maka agwa ekperima digasi ichiche nke gunyere: izi ori, ime ntapu ule, iso otu nzuzo nakwa otutu ndi ozo.
Na ikpazu ka omere ka amata na yabu ulo akwukwo nwere ngalaba omumu ihe di isii na onuogugu nke gunyere: ndi na agu gbasara ogwu nakwa iwa ndi mmadu afo amara dika medicine and surgery, ndi na agu gbasara izu ahia ogwu amara dika pharmacy na olu bekee nakwa otutu ngalaba ndi ozo.
Iga echetazi na yabu ulo akwukwo mahadum DUFUHS ji umuakwukwo iri abuo na isii wee bido na Ebonyi state na onwa January afo 2022.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.