Mahamoud Ali Youssouf nke mba Djibouti eturula ugo dịka onyeisi oche otu African Union commission.

Written by on February 17, 2025

Mahamoud Ali Youssouf nke mba Djibouti eturula ugo dịka onyeisi oche otu African Union commission.

Youssouf turu ya bụ ugo ụnyaahụ bụ Saturday ka e mechara ya bụ ntụliaka ugboro ise zuru oke dịka o meriri ogbo ya sitere na mba Kenya bụ Odinga Odinga n’agba nke anọ.

Nwa amadi ahụ ga e weghara ọkwa ọchịchị n’aka ogbo ya sitere na mba Chad bụ Moussa Faki Mahamat onye chigoro otu ahụ afọ asatọ zuru oke.

Youssouf onye gbara afọ iri ise na itoolu a rụọla ọrụ dịka onye nnọchiteanya mba Djibouti n’obodo Egypt tinyere ọkwa nke minista n’ahụ maka ihe na-eme n’obodo ọzọ nyere obodo ya bụ Djibouti kemgbe afọ 2005.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies