Mba Iran agwala ụmụ afọ ka onye ọ bụla hichapụ ọwa ozi WhatsApp na ekwe nti ya kwere maka na ọ bụ ebe ahu ka mba Israel si enweta ozi banyere ha.
Written by Onyinye on June 19, 2025
Otu igwe onyonyo nke ọ bụ mba Iran nwe ya anọrọla n’ụbọchị Tuesday were gwa ụmụ afọ ha ka onye ọ bụla gbaa mbọ wepụ ọwa ozi ọgbara ọhụrụ akpọrọ WhatsApp na ekwe ntị ha iji gbochie mba Israel ịga n’ihu na enweta ihe nzuzo banyere obodo ha.
Ozi ahụ ka ya bụ ọwa ozi azaghachila ha were sị na ozi ụgha dịka nke ahụ ga-eme ka e gbochie ya bụ ọwa ozi na mba Iran n’oge dịka ugbua ụmụ afọ ha kacha chosie ya ike. Ha kwuru na ọwa ozi ha nwere akọrọ ngwa nke nwa bekee kpọrọ end to end encryption nke pụtara na mmadụ ọbụla ma ndị nwe ya apụghị enwetanwu ozi banyere onye ọbụla n’ụwa niile.
Ịga echeta na ọ bụ ụlọrụ akpọrọ mẹta platform nke ọ bụ ha nwe ọwa ozi Facebook na Instagram nwekwa WhatsApp n’otu aka ahụ.
Mba Iran anọrọla n’ọtụtụ afọ ndị gara gbochie ụfọdụ ọwa ozi ọgbara ọhụrụ ịrụ ọrụ n’obodo ha mana ọtụtụ n’ime ụmụ afọ kana eji ụzọ mkpuke nke gụnyere usoro proxy yana nke akpọrọ virtual private network vpn abanyecha na ọwa ozi ndị ahụ oge ọbụla ha chọrọ.
Ha mechiri ọwa ozi WhatsApp yana Google play store n’afọ 2022 bụ oge ụmụ afọ mba Iran nuputara n’igwe mee ngagharị iwe nke otu nwaanyị ndị uwe ojii gburu na mba ahụ. Mana ewechara hapụ ka ọwa ozi ndị ahụ malite ọrụ ọzọ na ngwụcha afọ 2024 gara aga.
WhatsApp abụrụla otu ọwa ozi kacha ewu ewu na mba Iran tinyere ogbo ya bụ Telegram yana Instagram.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.