Mba Israel Awakpola Ozo Ma Gbuo Nari Kwuru Nari Ndi Mmadu Na Mba Lebanon
Written by admin on April 9, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Mba Israel ebuola nnukwute agha di egwu ma kwafuo obara otutu ndi mmadu na mba Lebanon dika osiri metuta agha yabu Israel noo kemgbe ebu megide ndi isi ekwe onwu Hezbollah nona mba ahu.
Na agha ohuru a mba Israel buru unya bu Wednesday ka ozi mere ka amata na ha dulara opekata mpe mmadu di nari abuo, iri ise na ano mmuo na ike.
Ndi agha Israeli Defence Forces IDF gakwara na iru noro yabu unya meruo ihe kariri otu puku, otu nari, iri isii na ise aru na agha ohuru a ha buru na mba Lebanon.
Na okwu ya ka onowu na okwa Prime yabu mba Lebanon bu Nawaf Salam katoro agha a Israel buru ohuru ma kwuputa otu ubochi iri uju nyere ndi ahu egburu na ike nakwa ndi nke nwetara ihe mmeru aru.
Prime Minister Nawaf Salam sitere na ulo olu ya kowa na ona agbakere ala ichikonata ndi okwe ndorondoro nakwa enyemaka sitere mba ndi ozo akporo diplomatic resources iji gbochie Israel agam na iru nkwafusi obara na mba ahu.
Na nke ya ka onowu nke mba Israel bu Benjamin Netanyahu mere ka amata na mba Lebanon esoghikwa na nkwekorita iwusagodu ngwa ogu ahu enwere na agha mba America jikoro aka yana yabu Israel ebu na mba Iran.
Na otu aka ahu ka osote onye isi ala mba America bu Vice President JD Vance kwenyere onowu mba Israel kowa na onweghi oge obuna ekwere nkwa sina agunyere mba Lebanon na ebe aga awusagodu ngwa ogu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.