Mba Ivory Coast ewegharala onodu n’ogige Port Bouet bụ ebe ahụ ndị agha mba nke France jibu mere isi ọnọdụ n’obodo ha.

Written by on February 21, 2025

Ọchịchị mba France nke nwere isi ọnọdụ na Paris enyefela ogige ndị agha ha akpọrọ Port Bouet n’aka ndị agha mba Ivory Coast.

Mba France abụrụla ndị nọrọ ọtụtụ afọ ka ọ dị ugbu a n’obodo Ivory Coast mana ha mere nkea dịka ndị agha ha malitere iji nwayọọ na-apụ na mpaghara ndịda anyanwụ nke ala ndị isi ojii kpamkpam.

Onye ji ọkwa minista nke ụsụụ ndị agha French Armed forces bụ Sebastian Lecornu mere ka amata na ndị jegoro ezumike nka n’ọrụ agha nke mba France bụ ndị ruru iri asatọ ka ga anọ na mba Ivory Coast ịdị na enye ọchịchị mba ahụ ndụmọdụ ma nyekwara ha aka n’ọrụ nke izu ndị agha ha.

Ndị agha mba France ruru otu puku ka ozi kwuru na a kpọpụru n’ogige Port Bouet bụ ebe ahụ ha jibu mere isi ọnọdụ ha na mba Ivory Coast.

N’oge ahụ ka mba abụọ ahụ nọrọ nwee nkwekọrịta ọhụrụ nke metụtara ndị agha obodo ha.

Mba Ivory Coast mekwara ka amata na ha ga abaghari ogige ahụ aha ọhụrụ ka ọ bụrụzie aha onye mbụ jibu ọkwa Chief of Army staff na mba ahụ Late General Thomas d’Aquin Quattara.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies