Ndi Oji Egbe Akusuola Chibuike Amaechi Na Rivers State
Written by admin on March 6, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi oji egbe eri ana enyoenyo na ha bu ndị akpobi ndorondoro ochichi akusuola igwe ugboala convoy onye ahu ji okwa onye ndu otu ndorondoro African Democratic Congress ADC na mpaghara South South ala anyi ma burukwa onye jitopuru okwa Minister huru maka njem bu Rotimi Chibuike Amaechi.
Nkusu igwe ugboala convoy yabu onye jibukwara okwa Governor Rivers State taata bu Friday ka anoro huta nkwakorita mgbo egbe na etiti ndi nchekwa yabu Chibuike Amaechi nakwa ndi oji egbe eri ahu.
Ozi mere ka amata na obu na agbata obodo yabu nwa amadi bu Ubima community nakwa obodo Omuanwa dicha na Ikwerre LGA nke Rivers State ka nkusu a were onodu taata.
Yabu ozi kowara na Rotimi Chibuike Amaechi wuchiri obodo ya ahu isonyere debanye aha na usoro owa ozi e-registration nke otu ndorondoro ADC na aga na iru.
Ndi huru ka nke a siri mee gwara ndi nta akuko na ndi oji egbe eri ahu gara gbochie okporo mana achighachi ugboala bus bucha ndi otu ndorondoro ADC aga yabu ndebanye aha azu.
Nke a na eme na ehihe taata dika habu ndi osochi egbu buru uzo noro na abali unya bu Thursday gba oku na ogige isi ulo olu otu ndorondoro ADC na onumara Ubima Ward bukwanu nke Chibuike Amaechi sitere.
Na okwu ya oge omechara nafere nkusu a ka Chibuike Amaechi gwara nari kwuru nari ndi otu ndorondoro ADC putara idebanye aha ha ka ha dere juu, ebe okenere Commissioner ndi uwe oji ala anyi na State ahu, onye Director ndi nchekwa oje na mmuo Department of State Services DSS nakwa onye Commandant ndi nchekwa Nigerian Security and Civil Defence Corps NSCDC maka ime ngwangwa gbata oso enyemaka na nwakpo nke ahu eburu uzo mee na abali gara aga na ogige isi ulo olu ADC.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.