Ndị otu World Igbo National Union WINU akatọla n’ebe ọdị ukwu okwu ahụ aka na achị Anambra State bu Governor Charles Chukwuma Soludo kwuru.
Written by Onyinye on July 11, 2025
Ndị otu World Igbo National Union WINU, otu ụmụ afọ Igbo na akwado udo, ọganihu nakwa mmepe nke ala Igbo, akatọla n’ebe ọdị ukwu okwu ahụ aka na achị Anambra State bu Governor Charles Chukwuma Soludo kwuru n’ọdị nso a na Maryland dị na mba United States of America, bu ebe oboro ebubu na 99.9% ndi oji egbe aga nọcha n’ime ọhia nke iwu na akwadoghi bucha ụmụ afọ Igbo.
N’ozi putara ihe bu nke odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bu Comrade Ifeanyi Uwakwe binyere aka na ya, otu WINU kọwara okwu Governor Soludo dika nke na abaghi uru, nke enweghị ntọala nakwa okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, dika ha kpọrọ oku ka oweputara ihe akaebe doro anya ma ọ bụ ọrịọ mgbaghara nke ohaneze.
Otu ahụ boro Governor Soludo ebubo na o kwuru okwu ahụ iji mee ka obi tọọ ndị na-akwado ndọrọndọrọ ọchịchị ya, Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu, ndị Fulani na-achị efi, ndị ọzọ ana enyo enyo nakwa ndị na eme nrụrụ aka na ala anyi a bu Nigeria ụtọ, kama ikwu okwu maka ọdịmma ndị obodo ya.
Otu WINU kwuru na ozi na aputagasi na ala anyi a nkwa na mba ụwa ekwupụtala ugboru ugboru na ọbu ndị Fulani na-achị efi na-eji ngwa ọgu, bu ndi na-ejikarị ngwa agha ọkaibe, dịka ndị na awakpo ọtụtụ ndị mmadụ na ugbo ha, ma nọrọcha n’ugbo ndị mmadụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị nakwa oke ọhịa dịcha na ndịda ọwụwa anyanwụ ala anyi a.
Otu ahụ kwuru okwu gbasara ebubo na Governor Soludo enweghị ike mezi ihe ndị ahụ na ebute enweghi ezi nchekwa zuru oke na Anambra State, ha bokwara ya ebubo na ọ na eleghara mwakpo ndị ahụ na-emegasi n’obodo ndị gụnyere Mgbakwu, Igboariam, Umueri, Umunze, Ogbunka nakwa Amansea, bu ebe ozi kọwara na ndị Fulani na-achi efi na enye nsogbụ anya.
N’ịji Abia State ma atụ, otu WINU gwara Governor Soludo ka ọ ghomie amụma enweghị ndidi megide ndị oji egbe aga ma kewapụ onwe ya site n’ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ana ebo ebubo na ha na-akwalite atumatu esemokwu dị iche iche dika RUGA settlement.
Otu ahụ gara n’iru buo ebubo na uwe ndị na arụ ọrụ dika Ndị Aka Odo nakwa Ndi Udo Ga-Achi na eyi bukwanu ndị ha na Governor na-achị sokwa na-ebute ọgba aghara na State ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.