Ndi Uwe Ojii Anaputala Ozu Onye Eze Odinala Ikwo Atoro Ma Gbuo Na Ike Na Ebonyi State

Written by on March 6, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi uwe ojii ala anyi na Ebonyi State emela ka amata na ha achoputago ma naputakwa ozu onye eze odinala obodo Ndufu Alike dina Ikwo LGA nke State ahu bu HRH Ezeogo Francis Igwe bukwanu onye anoro na odi nso a toro na ike.

Iga echeta na ndi oji egbe eri noro na ubochi uka gara aga na mpaghara Nwakpu Junction dina Ikwo LGA toro yabu onye eze odinala bu nna Dr Eric Kelechi Igwe jitopuru okwa Governor Ebonyi State oga ona aga uka.

Ozi mere ka amata na obu ogbatumtum ukwu abuo motorcycle ka habu ndi oji egbe eri kpuchichara iru jiri wakpo yabu onye eze odinala na ugboala ya ma toro ya na ike.

Ndi ojii egbe eri ahu mechara kpoturu ezinulo ya ma sina obu ego ntoghapu ransom di nde nari Naira abuo na iri ise yabu; 2 Hundred and 50 Million Naira ka aga akwu ha tupu ha atoghapu yabu onye eze odinala.

Ka osiladi, ndi osochi egbu ahu noziri ka akana akpa maka ikwu ha yabu nari nde kwuru nde Naira ego ntoghapu dula yabu eze odinala mmuo na ike.

Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Friday na ogige Police Command’s Headquarters dina Abakaliki ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu SP Joshua Ukandu mere ka amata na habu ndi uwe oji nwere nnukwute nkwakorita mgbo egbe nyere ndi oji egbe eri ahu ebe ha gbagburu otu onye ma nwuchiko ufodu na ime ha tupu ha anaputa ozu yabu onye eze odinala ha gburu na ike.

SP Ukandu kowara na ebugago ozu yabu onye eze odinala na oba nchekwa ozu maka nnyocha autopsy ebe ndi osochi ahu aka kpatara kana agabiga nnyocha na nke ndi uwe oji dika hana agbakere ala inwuchiko ndi ozo ka nona oso.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited