Ndi Uwe Ojii Anwuchiela Ode Akwukwo Ochichi Osun State Maka Ebubo Agwa Ekperima
Written by admin on July 30, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi uwe ojii ala anyi na Osun State anwuchiela ode akwukwo govt State ahu bu mazi Teslim Igbalaye nakwa mmadu ise ndi ozo maka ebubo agwa ekperima mgbere azum ahia akwukwo ntule aka ochichi amara dika vote buying nyere ntule aka Governorship election ga ewere onodu na State ahu na abali iri na ise nke onwa ozo bu August.
Na ozi ndi uwe ojii nyefere ndi nta akuko unya bu Wednesday na Osogbo ka ha mere ka amata na obu yabu unya ka aka ha kpatara mazi Igbalaye na ebe obibi ya dina Oriko Estate Area nke isi obodo State ahu, ebe enwetara otutu akwukwo ntule aka Permanent Voter Cards PVCs nakwa akwukwo ndeko register edekoro aha ndi na atu vote, gunyere ego di nde Naira ano na uma asato nakwa ihe ndi ozo ana enyoenyo na nke ya.
Habu ndi uwe ojii kowara na mmadu ise ndi ozo ahu anwuchikoro hana yabu ode akwukwo govt Osun State gunyere: Abiodun Arowomole amakariri dika Ashipa ma buru onye ekperima ndi uwe ojii noo kemgbe achoghari maka ebubo na ogburu mmadu, Taiwo Akande, Lukman Adeyemo, Muftau Olaoye nakwa Musiliu Aderemi.
Ka osiladi, na nzaghachi nyere nnwuchiko a ka ochichi Gov Ademola Adeleke na achi State ahu sitere ozi Commissioner na ahu maka mgbasa ozi bu Kolapo Alimi weputara katoo njem ndi uwe ojii na bee yabu ode akwukwo ochichi State, ma kowa ya dika nke megidere iwu.
Ndi nta akuko nwetaziri ozi na obu yabu ode akwukwo Osun State mechara jiri aka onwe ya gaa nyefe ba nnwuchiko ndi uwe ojii kwere maka na enwetaghi ya na bee ya oge ndi uwe ojii ahu gaara.
