Ndị uweojii ala anyị sitere Police Headquarters dị na Abuja akpala ike dị egwu site n’iwepu otu ndị osochi egbu n’ime izu ụka gara.

Written by on July 28, 2025

Ndị uweojii ala anyị sitere Police Headquarters dị na Abuja nọrọ ụnya bu Sunday mee ka amata na ndị uweojii nke ngalaba Force Intelligence Department- Intelligence Response Team FID-IRT, kpara ike dị egwu site n’iwepu otu ndị osochi egbu atọ ji egbe n’oge ọtụtụ ndị uweojii ahụ zutere ha n’ime izu ụka gara.

Nkea putara ihe site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uweojii bu ACP Muyiwa Adejobi, dika ọ kọwara na ha menwuru nke ahụ site na ezi atụmatụ nakwa ọrụ ndị uweojii rụgasiri na Taraba, Plateau, Adamawa, Nasarawa nakwa Niger States.

Ọ gakwara n’iru kọwaa na ndi osochi egbu ahụ chọrọ iri mbọ mbọ ọsọ oge ha hụrụ ndị uweojii ahụ mana emechara merie ha dika ha zokọritara mgbo egbe ka mmiri, ebe ha hapụrụ ngwa ọgụ ha ma burucha ọnụ mgbo egbe rie mbọ mbọ ọsọ.

Ndị uweojii ahụ gara n’iru n’ọrụ ha, dika ha nwetara egbe AK-47 rifles iri, ọtụtụ ngwa ọgụ ejiri kpa arụ dị iche iche ndị gụnyere, ntọri, ori nakwa efi ezuru ezu.

O mekwara ka amata na nyocha na aga n’iru iji chọpụta ma nwuchikọ ndị osochi egbu ahụ gbara ọsọ bu ndi achọpụtagoro na aka ha dị na mwakpo ndị ahụ ana eme na States ndị a akpọrọ aha.

Inspector-General of Police bu IGP Kayode Adeolu Egbetokun, ekweghachila nkwa ọzọ njikere ndị uweojii dị iji weta ogbugbo nyere enweghi nchekwa na ala anyi a, dika ha na aga n’iru n’ọrụ ha iji kpochapụ ndị omekome, ma nye nchekwa gara ndu ndi mmadụ nakwa ihe ha nwere na ala anyi bu Nigeria gba gburugburu.

Dika ọ gara n’iru riọ ohaneze ka ha na enyere ndị uweojii aka site n’ikpọtụrụ ha mgbe ọbula ha hụtara ihe dị agha na gburugburu ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited