Ndị uweojii emela ka amata na opekata mpe mmadụ iri na otu nwetara ihe mmerụ ahụ site na mwakpo emere na Michigan.
Written by Onyinye on July 28, 2025
Ndị uweojii emela ka amata na opekata mpe mmadụ iri na otu nwetara ihe mmerụ ahụ site na mwakpo emere na ụlọ ahịa Walmart dị na Midwestern State nke Michigan na mba United States.
Grand Traverse County Sheriff Michael Shea gwara ndị nta akụkọ na nwa amadi ahụ ana enyo enyo bu onye ji mma wakpo ma merụo ndị mmadụ ahụ n’ụlọ ahịa ahụ nọzi n’aka ndị uweojii k’ọdị ugbua.
Ọ gara n’iru mee ka amata na opekata mpe mmadụ atọ bu ndi na anata ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ, ebe ndị ahụ nwetara ihe mmerụ ahụ gụnyere ụmụ nwoke mmadụ ịsịị nakwa ụmụ nwanyi mmadụ ise.
Aka na achi Michigan bu Governor Gretchen Whitmer, emela ka amata na ya na ndị omebe iwu na enwe mkpakrita uka maka ọdachi ahụ mere.
FBI Deputy Director bu Dan Bongino mere ka amata na nyocha na aga n’iru iji chọta ihe kpatara mwakpo ahụ emere na ụlọ ahịa Walmart.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.