Ndi uweojii na Rivers State emela ka amata maka nwakpo nakwa ntaramahụhụ emere onye nchịkwa nke Ahoada-East LGA bu Hon. Goodluck Iheanachor.
Written by Onyinye on June 23, 2025
Ndi uweojii na Rivers State emela ka amata maka nwakpo nakwa ntaramahụhụ emere onye nchịkwa nke Ahoada-East LGA bu Hon. Goodluck Iheanachor site n’aka ihe ruru mmadụ iri atọ bu ndi ana ebo ebubo na ọ bu ndi na arụ ya ọrụ n’ọkwa Chief Security Officer CSO nakwa Chief of Staff COS nọ n’isi ya.
Nkea mere na abalị iri abuo n’ọnwa June afọ a bu 2025 n’ihe dịka ojiri nkeji iri anọ gafee elekere mbu nke ehihie n’ime Council Secretariat.
Ndị uweojii kọwara na ndi omekome ahụ jichiri Iheanachor, napụ ya ekwentị ya n’ike ma manye ya ka obinye aka na akwụkwọ nkwusi ọrụ ya bu nke emechara hụta na uwa ozi.
Ihe onyonyo ahụ na efeghari n’ụwa ozi na ngwucha ịzụ ụka gosiputara etu ndị omekome ahụ siri emegide ya n’ime Council secretariat ahụ.
Dika ahutakwara onye odeakwụkwọ nke LG Council ahụ bu Mazi Alabi etu ndị omekome ahụ si megidekwa ya n’ihe onyoonyo ahụ.
Onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu SP Grace Iringe-Koko mere ka nkea puta ihe na Port Harcourt bu isi obodo State ahụ.
Iringe-Koko gara n’iru mee ka amata na Iheanachor nwetara ọtụtụ ihe meru ahụ dika ọ nọ n’ụlọ ọgwụ anata ọgwụgwọ k’ọdị ugbua.
Commissioner ndị uweojii bu CP Olugbenga Adepoju nakwa ndị isi nke nchekwa sister security agencies, bịara n’ebe ahụ emere yabụ nwakpo ma nye iwu ka amalite nyocha ozugbo ozugbo.
CP nyekwara iwu ka ndị nile aka ha dị na nwakpo ahụ bịa n’isi ụlọ ọrụ ndị uweojii dị na Moscow Road, Port Harcourt maka ịgba ha ajụjụ ọnụ.
Ndị uweojii ahụ katọrọ akparama agwa ahụ akpasoro Iheanachor dika ha malitegoro ọrụ ha iji hụ na ndị ahụ aka ha dị n’ọba ahụ ekere ede nwetara ntaramahụhụ ruru ha.
Ha gara n’iru kwughachi njikere ha dị iji hụ na ana edebe iwu na State ahụ ma rịọ ohaneze ka ha dere juu ma nyekwara ndị uweojii aka site n’inye ha ozi ga abara ha uru dika nyocha ka na aga n’iru.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.