Nigeria Ekwuputala Nkesa Ogwu Mgbochi Gaara Ndi Buu Nje HIV
Written by admin on March 2, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ulo olu ala anyi na ebu agha emegide nje Human Immunodeficiency Virus HIV nakwa nna ya ukwu bu Acquired Immune Deficiency Syndrome AIDS amara dika National Agency for the Control of AIDS NACA emela ka amata na ndi nwere nje HIV na Nigeria ka aga enye ogwu mgbochi amara dika Lenacapavir na onwa a bu March afo 2026.
Yabu ulo olu NACA gakwara na iru mee ka amata na nnyocha ha megoro na egosi na yabu ogwu nwere ike igbochi nje HIV na aru onye obuna bu ya.
Ulo olu a kowara na yabu ogwu ka aga na agba onye obuna buu nje HIV ugboro abuo kwa afo obuna iji huna yabu oya ka egbochiri imebi akuru ngwa ndi ahu na ebu agha emegide nje di ndi buu ya na aru.
Ulo olu NACA gbakwunyekwara na yabu ogwu anatago nkwado sitere na aka ulo olu na ahu maka ogwu nakwa nri ndi mmadu na eri na Nigeria amara dika National Agency for Food and Drug Administration and Control NAFDAC .
Na ikpazu ka NACA mere ka amata na onye obuna buu yabu nje HIV gana akwu ego di dollar iri ano kwa afo obuna maka inwete yabu ogwu Lenacapavir ugboro abuo kwa afo.
Iga echetazi na nnyocha na egosi na ndi buu nje HIV na Nigeria di otu nde na mmadu iteolu, dika nke achoputara ohuru dizi puku iri asaa na ano, tinyekwara na ogbugo mmadu di iri ise na otu na afo 2021 na Nigeria.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.