Nnyocha Ochichi Etiti Egosila Asambodo Awarawa Uche Nnaji
Written by admin on March 6, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu nnyocha akporo Investigative Panel ochichi etiti ala anyi guzobere maka ilebara anya na ebubo asambodo awarawa eboro onye ahu gbagoro onwe ya alukwaghim na okwa minister ala anyi huru maka usoro ogbaru ohuru, ihe omimi science nakwa nka na uzu bu Chief Uche Nnaji emechala nnyocha ma kwuputa na obu eziokwu na yabu Chief Nnaji nwetara asambodo mahadum awarawa na udi ha kporo forged degree certificate.
Yabu otu Panel nke obu Minister na ahu maka mmuta bu Dr Tunji Alausa guzobere mere ka amata na obu mahadum University of Nigeria, Nsukka UNN ka Uche Nnaji na ebughari asambodo awarawa na udi na obuna yabu mahadum ka oguru akwukwo ma nweta nzere mmuta.
Na okwu nchocha ya taata bu Friday ka onye isi oche yabu otu nnyocha bu Rakiya Gambo Ilyasu mere ka amata na ha siri imi nnyocha na ala nke oma ma nyee ezi ohere nkowa na nnyocha a.
Gambo Ilyasu kowara na ha kpoturu yabu mahadum UNN ma nyochacha ihe niile banyere ndeko ndi guru akwukwo na ndi nwetara asambodo were choputa na Uche Nnaji bu asambodo awarawa ka ona ebughari.
Otu a kwuputara na ha choputara na Nnaji nwetara ohere agum akwukwo na mahadum ahu na ogogo ya nke afo 1981/1982 academic session maka ihe omumu Biological Sciences mana omechaghi gucha akwukwo ya kwere maka na odara ule alaka ihe omume ya akporo Virology.
Iga echetazi na Uche Nnaji noro na ebe ngwucha afo 2025 gara aga gba alukwaghim na okwa ya dika Minister ogogo etiti Nigeria kwere maka ebubo yabu asambodo awarawa ma buru nke omere inye ohere ezi nnyocha na ebubo a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.