Nyesom Wike nakwa ndi otu ya ezutela aka na achi Rivers State
Written by admin on October 19, 2026
by Chika Nwazu

Wike-Fubara
Minister na-ahụ maka Federal Capital Territory (FCT), Abuja bụ Nyesom Wike, na ụfọdụ ndị isi otu Rainbow Coalition ezutela n’ụlọ obibi Gov Siminalayi Fubara na-achị Rivers State dị na Port Harcourt ụnyaahụ bụ ụka.
Onye enyemaka Wike n’ihe gbasara mgbasa ozi, bụ Lere Olayinka, mere ka nke a pụta ihe site n’ozi o tinyere na owa ozi ya.
Akụkọ na-egosi na Wike bụbu aka chịrị Rivers State, na-aga n’ihu na nzukọ ya na ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ.
Rainbow Coalition bụ otu nkwado ndọrọndọrọ ọchịchị jikọtara ọtụtụ party, nke ehibere iji kwado mbọ President Bola Ahmed Tinubu maka ịlaghachi n’ọkwa onyeisiala na ntuli aka afọ 2027.
Wike ekwuola na mbụ n’ajụjụ ọnụ agbara ya na Gov Siminalayi Fubara dị njikere ịkwado mbọ Tinubu na-eme maka ịlaghachi n’ọkwa onyeisiala, tinyere ndị ọzọ na-azọ ọkwa ọchịchị dị iche iche.