Ochichi Enugu State Adola Aka Na Nti Megide Oya Lassa Fever Na State a.

Written by on March 5, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt Enugu State dina aka ochichi Gov Peter Ndubuisi Mbah agwala ogige aruike niile dina State a ka ha muru anya nke oma iji buo agha megide oya Lassa fever ma onwere ka osiri selite isi na State a.

Nke a bu kwere maka elu oji yabu ajo oya na ari na ufodu State gbara Enugu State agbata obi.

Na okwu ogwara ndi nta akuko unya bu Wednesday na isi obodo Enugu ka Commissioner na ahu maka aruike bu Prof George Ugwu mere ka amata na State a di njikere nke oma ibu agha megide yabu oya Lassa fever ma onwa anwa bata.

Prof Ugwu yoro ndi olu aruike nakwa ohaneze ndi bina State a ka ha gbasoro nke oma usoro mgbochi megide yabu oya ibata State a.

Yabu Commissioner gwara ohaneze ka ha na edebe gburugburu ha ocha iji zeere oke ibata ebe ha no, ma hukwa na ha suchasiri ahiha didebere gburugburu ha gunyere imechisi oghere obuna dina ulo ha iji huna oke enweghi ike ibata zoo onwe ha na habu oghere.

Prof George Ugwu doro aka na nti megide igba nri oriri na anwu na ebe ghere oghe maka oke imetu onu na ha, ma zeere ihe obuna bu imetu onu na oke yanakwa ihuna osiso sitere na aru onye bu oya a emetughi ha na aru.

Ozi mere ka amata na State ndi ahu gbara Enugu State agbata obi oya a bu Lassa fever na akpa ike ojo na ha gunyere: Benue State nke enwetagoro mkpesa mmadu di nari abuo na iri ise ana enyoenyo na ha butere ya mana obu mmadu iri ano na ise ka achoputagoro butere yabu oya, ebe oya ojo a dulagoro mmadu iri mmuo na ike na State ahu, gunyekwara Ebonyi State enwetagoro ihe kariri mmadu isii oya a kpatagoro aka ojo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited