Ochichi Enugu State Ayiola Ndi Ntorobia State A Ka Ha Gaa Sonyere Na Ohere Olu Agha Nigerian Army Na Aga Na Iru Na Ala Anyi

Written by on April 10, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt Enugu State dina aka ochichi Gov Peter Ndubuisi Mbah ayiola ndi ntorobia State a tozuru oke ka ha jiri ohere iwena olu agha na aga na iru ka odi ugbu a na ala anyi banye nke oma dika ndi agha elu ala Nigerian Army.

Nke a ka ochichi State a kwuputara na ohere iwena olu agha a na ogogo nke 91 Regular Recruits Intake emepego maka ndi choro ibanye olu agha soldier ala anyi.

Na okwu ya unya bu Thursday ka Commissioner State a na ahu maka mgbasa ozi nakwa nzikorita ozi bu Dr Malachy Agbo mere ka amata na ihe niile banyere iwena yabu olu agha military buna efu ka ana eme ya.

Dr Agbo kowara na idega akwukwo anam acho olu na udi application process banyere olu agha Nigerian Army a malitere na abali iri ato nke onwa March gara aga ebe oga akuru onu na abali iri na asaa nke onwa ozo bu May afo a bu 2026.

Yabu Commissioner mgbasa ozi nakwa nzikorita ozi yoziri ndi ntorobia State a tozuru oke ka ha dega akwukwo anam acho olu site na usoro owa ozi official recruitment portal of the Nigerian Army nke akara ya bu recruitment.army.mil.ng

Okwuputara na ndi obuna degara akwukwo anam acho olu agha a ga agabiga nnyocha owa ozi online screening ebe aga anoro roputa ndi tozuru oke ga aga nnwale iru na iru physical screening exercise nke ga ewere onodu na ebe obibi ndi agha Abakpa Barracks dina usuu habu ndi agha nke 82 Division of the Nigerian Army na isi obodo Enugu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited