Ochichi Enugu State Eweputala Nhazighari Ohuru Nyere Ngwuputa Aku Onatarachi Ime Ala
Written by admin on March 13, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ochichi Gov Peter Ndubuisi Mbah na achi Enugu State emela ka amata atumatu ya nyere nhazighari ngalaba aku onatarachi siri ike nakwa ngwuputa aku ime ala iji bugo uto akuluba nakwa ume oku gunyere nkwuba aka oto na ihe banyere nchikwa habu ngalaba na obodo niile enwere na State a.
Nke a putara ihe na obi govt Enugu site na onu onye ndumodu puru iche nyere Gov Peter Mbah na ihe metutara aku onatarachi siri ike nakwa ngwuputa aku ime ala bu Engr Samuel Onyinye Okoro na okwu ogwara ndi nta akuko banyere ka ihe siri aga na ulo olu ya kemgbe omalitere olu.
Engr Okoro kwuputara na ochichi State a agago mee eserese iji choputa ubara nakwa ume aku onatarachi ndi ahu enwegasiri na mpaghara di ichiche nke State a.
Okowara na ochichi State a ebuola agha megide ndi na egwuputa aku onatarachi ime ala na uzo megidere iwu bukwanu nke na ebute odachi gburugburu na otutu obodo dina State a.
Yabu onye ndumodu puru iche nyere Gov Mbah gwara ndi nta akuko na Enugu State nwere aku onatarachi unyi nwa bekee bu Coal kariri nari nde tonnes ato anoro na mbu chee na odi.
Okowaziri na nke a ga enyere State a aka na atumatu inweta ume oku otu puku megawatts site na yabu aku onatarachi unyi Coal.
Engr Samuel Onyinye Okoro kwuputara na ulo olu ngwuputa aku onatarachi ime ala gana ebinyezi aka nkwekorita mmepe obodo akporo Community Development Agreements nyere obodo niile hana egwuputa aku ime ala na ha ma hukwa na hana enwe nrube isi na usoro na achikwa gburugburu tupu ha amalite olu.
Onye nta akuko anyi na obi govt Enugu bu Treasure Moses wetara ozi na yabu onye ndumodu puru iche nyere aka na achi State a kowara na ochichi Enugu State na aruko olu nyere ulo olu nchikwa govt etiti di ichiche site na usoro akporo multi stakeholders platform amara dika Mineral Resources and Environmental Management Committee ihuna ana enwe nrube isi nke oma na iwu niile na achikwa ngwuputa aku onatarachi ime ala na State a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.