Ochichi Etiti Amalitela Na Ozuzu Oke Mmachi Mmanya Ekechiri Na Ngwugwu Nakwa Nke Obere Ololo.

Written by on March 3, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt etiti ala anyi amalitela na ozuzu oke itinye na olu nakwa nkuzi nyere ohaneze banyere mmachi ahu amachiri mmanya na aba na anya ekechiri na ngwugwu nakwa nke obere ololo na udi akporo sachet and small bottle alcoholic beverages na mpaghara niile nke ala anyi a.

Nke a putara ihe taata bu Tuesday na ogbako ndi nta akuko ulo olu National Orientation Agency nakwa National Agency for Food and Drug Administration and Control NAFDAC gunyere ulo olu Federal Competition and Consumer Protection Commission jikoro aka chikoba na Abuja.

Na okwu ya ka onye Director General ulo olu NAFDAC bu Prof Mojisola Adeyeye mere ka amata na ntinye na olu mmachi habu mmanya ngwugwu nakwa nke obere ololo na abia dika ogasiri otutu afo emere mkpoturu nakwa mgbatikwu oge banyere ha, yanakwa nnyocha choputara ihe iyi egwu ha megide onodu umuaka ala anyi.

Na nke ya ka onye Director General ulo olu National Orientation Agency bu Lanre Issa-Onilu kowara nke a dika uzo ka mma nyere nchekwa ohaneze ndi Nigeria.

Issa-Onilu kwuputara na ulo olu ya ga eweputa usoro na akuru ngwa gazuoro mpaghara niile dina Nigeria maka nkuzi yana ime ka ohaneze na enwe nrube isi na mmachi a amachiri habu mmanya na aba na anya ekechiri na ngwugwu nakwa obere ololo.

Ozi kowara na obu kemgbe abali mbu nke onwa January afo a bu 2026 ka mmachi habu mmanya malitere bukwanu nke amachiri iruputa, ikesa ma obu iresa ndi mmadu habu mmanya ngwugwu nakwa nke obere ololo ozo na obodo a bu Nigeria.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited