Ochichi Kano State Enyela Iwu Arukwaghim Gaara Ufodu Ndi Akpolitere Na Okwa Na State Ahu

Written by on March 25, 2026

by Chika Nwazu

Ọchịchị Kano State enyela ntụziaka ka onye ọ bụla a kpọlitere nọkwa na state ahụ bụ onye nwere mmasị ịzọ otu ọkwa nkea ma ọ bụ nke ọzọ n’afọ 2027 gbaa arukwaghim nọkwa ya ugbua tupu ana eru n’abalị iri atọ n’otu nke ọnwa March afọ 2026.

Nkea pụtara ihe n’akwụkwọ ozi ode akwụkwọ nyere gọọmenti state ahụ bụ Umar Farouk Ibrahim binyere aka ya n’abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa March.

Ndị nkea kacha metụta bụ ndị ahụ ọkwa ha gbagotere dịka ndị Commissioner, ndị ndụmọdụ pụrụ iche, Directors General yana ọtụtụ ndị ọzọ.

Ha kwuru na nzọụkwụ ahụ dabara n’iwu na-achịkwa ntụli aka ọchịchị n’ala anyị nke afọ 2026.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited